Jenesis 49

Onye na-agbanwe agbanwe dịka mmiri dị nʼiyi, ị gaghị abụkwa onye mbụ, nʼihi na ị banyere nʼihe ndina nna gị, i dinara nʼihe ndina m, merụọ ya.

Genesis 49:4 (UKJV) Unstable as water, you shall not excel; because you went up to your father's bed; then defiled you it: he went up to my couch.

2“Zukọọnụ nụrụ, ụmụ ndị ikom Jekọb nụrụ okwu nna unu Izrel.

3“Ruben, ọkpara m ka ị bụ, ume m, ihe ngosi mbụ nke ike m, onye nsọpụrụ kwesiri, onye mbụ nʼịdị ike.

4Onye na-agbanwe agbanwe dịka mmiri dị nʼiyi, ị gaghị abụkwa onye mbụ, nʼihi na ị banyere nʼihe ndina nna gị, i dinara nʼihe ndina m, merụọ ya.

5“Simiọn na Livayị bụ ụmụnne. Mma agha ha bụ ngwa ihe ike.

6Ka obi m ghara isonye nʼizuzu ha, ka m ghara isonye nʼọgbakọ ha, nʼihi na ha gburu mmadụ nʼoge iwe ha, bipụkwa nkwonkwo ụkwụ ụmụ ehi na-echeghị echiche.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.