Jenesis 49

“Zukọọnụ nụrụ, ụmụ ndị ikom Jekọb nụrụ okwu nna unu Izrel.

Genesis 49:2 (UKJV) Gather yourselves together, and hear, all of you sons of Jacob; and hearken unto Israel your father.

1Mgbe ahụ, Jekọb kpọkọtara ụmụ ya ndị ikom niile nʼotu sị ha, “Zukọọnụ ka m gwa unu ihe ga-adakwasị unu nʼụbọchị dị nʼihu.

2“Zukọọnụ nụrụ, ụmụ ndị ikom Jekọb nụrụ okwu nna unu Izrel.

3“Ruben, ọkpara m ka ị bụ, ume m, ihe ngosi mbụ nke ike m, onye nsọpụrụ kwesiri, onye mbụ nʼịdị ike.

4Onye na-agbanwe agbanwe dịka mmiri dị nʼiyi, ị gaghị abụkwa onye mbụ, nʼihi na ị banyere nʼihe ndina nna gị, i dinara nʼihe ndina m, merụọ ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.