Jenesis 5

O kere ha nwoke na nwanyị, gọziekwa ha. Mgbe e kere ha, ọ kpọrọ ha mmadụ.

Genesis 5:2 (UKJV) Male and female created he them; and blessed them, and called their name Adam, in the day when they were created.

1Nke a bụ usoro ihe ndepụta banyere agbụrụ Adam. Mgbe Chineke kere mmadụ, o kere ya nʼoyiyi Chineke.

2O kere ha nwoke na nwanyị, gọziekwa ha. Mgbe e kere ha, ọ kpọrọ ha mmadụ.

3Mgbe Adam gbara narị afọ na iri afọ atọ, ọ mụrụ nwa ya nwoke nʼoyiyi nke ya, na nʼụdịdị nke ya. Ọ gụrụ ya Set.

4Site nʼoge a mụrụ Set, Adam dịrị ndụ narị afọ asatọ ọzọ, ọ mụrụ ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.