2Josef nyere iwu, ka ndị dibịa na-ejere ya ozi gbasie ozu nna ya. Ya mere, ndị dibịa ahụ gbasikwara Izrel.
3O were ha iri ụbọchị anọ ịgbasi ozu, nʼihi na nke a bụ oge o kwesiri iwe ha ime ya. Mgbe nke a gasịrị, a kwara ya nʼala Ijipt iri ụbọchị asaa.
4Mgbe oge iru ụjụ gafesịrị, Josef gwara ndị ụlọ Fero sị ha, “Ọ bụrụ na m ahụtala amara nʼihu unu, biko, gwaranụ m Fero otu a, sị ya,
5‘Nna m mere ka m ṅụọra ya iyi mgbe ọ na-anwụ, sị, “Lee, agala m ịnwụ, ị ga-eli m nʼili m, nke m gwuuru onwe m nʼala Kenan.” Ugbu a, biko ka m gaa lie nna m, ma lọghachikwa.’ ”
6Fero zara sị ya, “Gaa lie nna gị dịka o mere ka ị ṅụọ iyi na ị ga-eme.”