Jenesis 7

Ha onwe ha, na anụ ọhịa ọbụla, nʼụdị ya, na anụ ụlọ ọbụla, nʼụdị ya na ihe ọbụla e kere eke na-akpụgharị nʼala, nʼụdị ya, na anụ ufe ọbụla nʼụdị ya, na aha nnụnụ ọbụla na ihe ọbụla nwere nku.

Genesis 7:14 (UKJV) They, and every beast after his kind, and all the cattle after their kind, and every creeping thing that creeps upon the earth after his kind, and every fowl after his kind, every bird of every sort.

12Mmiri zogịdere na-esepụghị aka iri ụbọchị anọ, ehihie na abalị.

13Nʼụbọchị ahụ kpomkwem, Noa banyere nʼụgbọ mmiri ahụ, ya na Shem, Ham na Jafet, bụ ụmụ Noa, na nwunye Noa, na ndị nwunye atọ nke ụmụ ya.

14Ha onwe ha, na anụ ọhịa ọbụla, nʼụdị ya, na anụ ụlọ ọbụla, nʼụdị ya na ihe ọbụla e kere eke na-akpụgharị nʼala, nʼụdị ya, na anụ ufe ọbụla nʼụdị ya, na aha nnụnụ ọbụla na ihe ọbụla nwere nku.

15Ha bịakwutere Noa nʼime ụgbọ mmiri ahụ, abụọ abụọ site nʼihe niile ọbụla e kere eke, nke nwere ume ndụ nʼime ha.

16Ma ndị banyerenụ bụ oke na nwunye, site na ihe niile nwere ndụ dịka Chineke nyere ya nʼiwu. Mgbe ahụ, Onyenwe anyị mechiri ọnụ ụzọ dị nʼụgbọ mmiri ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.