Jenesis 7

Ma ndị banyerenụ bụ oke na nwunye, site na ihe niile nwere ndụ dịka Chineke nyere ya nʼiwu. Mgbe ahụ, Onyenwe anyị mechiri ọnụ ụzọ dị nʼụgbọ mmiri ahụ.

Genesis 7:16 (UKJV) And they that went in, went in male and female of all flesh, as God had commanded him: and the LORD shut him in.

14Ha onwe ha, na anụ ọhịa ọbụla, nʼụdị ya, na anụ ụlọ ọbụla, nʼụdị ya na ihe ọbụla e kere eke na-akpụgharị nʼala, nʼụdị ya, na anụ ufe ọbụla nʼụdị ya, na aha nnụnụ ọbụla na ihe ọbụla nwere nku.

15Ha bịakwutere Noa nʼime ụgbọ mmiri ahụ, abụọ abụọ site nʼihe niile ọbụla e kere eke, nke nwere ume ndụ nʼime ha.

16Ma ndị banyerenụ bụ oke na nwunye, site na ihe niile nwere ndụ dịka Chineke nyere ya nʼiwu. Mgbe ahụ, Onyenwe anyị mechiri ọnụ ụzọ dị nʼụgbọ mmiri ahụ.

17Uju mmiri nọgidere nʼụwa iri ụbọchị anọ. Mgbe mmiri ndị a na-aba ụba, ha buliri ụgbọ mmiri ahụ elu site nʼelu ala.

18Mmiri ndị a toro na-ala elu na-abawanyekwa ụba nʼelu ụwa. Ụgbọ mmiri ahụ segooro nʼelu mmiri.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.