16Ma ndị banyerenụ bụ oke na nwunye, site na ihe niile nwere ndụ dịka Chineke nyere ya nʼiwu. Mgbe ahụ, Onyenwe anyị mechiri ọnụ ụzọ dị nʼụgbọ mmiri ahụ.
17Uju mmiri nọgidere nʼụwa iri ụbọchị anọ. Mgbe mmiri ndị a na-aba ụba, ha buliri ụgbọ mmiri ahụ elu site nʼelu ala.
18Mmiri ndị a toro na-ala elu na-abawanyekwa ụba nʼelu ụwa. Ụgbọ mmiri ahụ segooro nʼelu mmiri.
19Mmiri ndị ahụ toro laa elu kpuchie ugwu ukwu niile dị nʼokpuru mbara eluigwe.
20Mmiri ndị a toro kpuchiri ugwu niile, ruo na ịla elu mmiri ndị a site nʼelu ugwu ukwu niile ruru mita asaa.