Jenesis 7

Uju mmiri nọgidere nʼụwa iri ụbọchị anọ. Mgbe mmiri ndị a na-aba ụba, ha buliri ụgbọ mmiri ahụ elu site nʼelu ala.

Genesis 7:17 (UKJV) And the flood was forty days upon the earth; and the waters increased, and bare up the ark, and it was lift up above the earth.

15Ha bịakwutere Noa nʼime ụgbọ mmiri ahụ, abụọ abụọ site nʼihe niile ọbụla e kere eke, nke nwere ume ndụ nʼime ha.

16Ma ndị banyerenụ bụ oke na nwunye, site na ihe niile nwere ndụ dịka Chineke nyere ya nʼiwu. Mgbe ahụ, Onyenwe anyị mechiri ọnụ ụzọ dị nʼụgbọ mmiri ahụ.

17Uju mmiri nọgidere nʼụwa iri ụbọchị anọ. Mgbe mmiri ndị a na-aba ụba, ha buliri ụgbọ mmiri ahụ elu site nʼelu ala.

18Mmiri ndị a toro na-ala elu na-abawanyekwa ụba nʼelu ụwa. Ụgbọ mmiri ahụ segooro nʼelu mmiri.

19Mmiri ndị ahụ toro laa elu kpuchie ugwu ukwu niile dị nʼokpuru mbara eluigwe.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.