7Noa banyere nʼụgbọ mmiri ahụ, ya na ụmụ ya ndị ikom na nwunye ya, na ndị nwunye ụmụ ya ndị ikom ịgbanarị uju mmiri ahụ.
8Ụmụ anụmanụ ndị dị ọcha, na ndị na-adịghị ọcha, abụọ abụọ, tinyere anụ ufe na ihe niile e kere eke na-akpụgharị nʼala, abụọ abụọ kwa,
9oke na nwunye, bịakwutere Noa soro ya banye nʼụgbọ mmiri ahụ, dịka Chineke nyere Noa nʼiwu.
10Mgbe abalị asaa gafere, uju mmiri ahụ bịakwasịrị ụwa.
11Nʼafọ narị isii nke ndụ Noa, nʼọnwa nke abụọ, nʼụbọchị nke iri na asaa, bụ ụbọchị isi iyi niile dị nʼime ime ala nupụtara nʼelu ala, mmiri niile dị na mbara eluigwe ka a hapụrụ ka ha wụdata nʼụwa.