Jenesis 8

Mmiri ahụ dị nʼụwa ji nwayọọ na-ata. Mgbe narị ụbọchị na iri ụbọchị ise gafesịrị, mmiri ahụ atalatala.

Genesis 8:3 (UKJV) And the waters returned from off the earth continually: and after the end of the hundred and fifty days the waters were decreased.

1Ma Chineke chetara Noa na ụmụ anụ ọhịa niile, na ụmụ anụ ụlọ niile so ya nọdụ nʼụgbọ mmiri ahụ. O zitere ifufe, mee ka o fee nʼelu mmiri ahụ ime ka mmiri ahụ bido ịta.

2A kpọchiri isi iyi mmiri niile dị nʼime ime ala, kpọchiekwa ọnụ ụzọ mmiri ozuzo nke mbara eluigwe. Mmiri kwụsịrị isi na mbara eluigwe na-ezokwasị ụwa.

3Mmiri ahụ dị nʼụwa ji nwayọọ na-ata. Mgbe narị ụbọchị na iri ụbọchị ise gafesịrị, mmiri ahụ atalatala.

4Nʼụbọchị iri na asaa nke ọnwa asaa, ụgbọ mmiri ahụ gara nọkwasị nʼelu ugwu Ararat.

5Mmiri a gara nʼihu na-ata ruo ọnwa nke iri. Nʼụbọchị nke mbụ nke ọnwa iri, e bidoro ịhụ elu ugwu ndị ọzọ anya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.