4Nʼụbọchị iri na asaa nke ọnwa asaa, ụgbọ mmiri ahụ gara nọkwasị nʼelu ugwu Ararat.
5Mmiri a gara nʼihu na-ata ruo ọnwa nke iri. Nʼụbọchị nke mbụ nke ọnwa iri, e bidoro ịhụ elu ugwu ndị ọzọ anya.
6Mgbe iri ụbọchị anọ gafere, Noa meghere oghereikuku ọ rụnyere nʼakụkụ ụgbọ mmiri ahụ,
7site nʼebe ahụ zipụ otu ugolọma nke na-efepụ na-efebatakwa, tutu ruo mgbe mmiri kọrọ nʼelu ala.
8Emesịa, o zipụrụ otu nduru iji mata ma mmiri ọ kọọla nʼala,