5Mmiri a gara nʼihu na-ata ruo ọnwa nke iri. Nʼụbọchị nke mbụ nke ọnwa iri, e bidoro ịhụ elu ugwu ndị ọzọ anya.
6Mgbe iri ụbọchị anọ gafere, Noa meghere oghereikuku ọ rụnyere nʼakụkụ ụgbọ mmiri ahụ,
7site nʼebe ahụ zipụ otu ugolọma nke na-efepụ na-efebatakwa, tutu ruo mgbe mmiri kọrọ nʼelu ala.
8Emesịa, o zipụrụ otu nduru iji mata ma mmiri ọ kọọla nʼala,
9ma nduru ahụ achọtaghị ebe o nwere ike ibe, nʼihi na mmiri ka tojuru elu ụwa niile. Nʼihi ya, nduru ahụ lọghachikwutere Noa nʼime ụgbọ ahụ. Noa setịpụrụ aka ya nwụbata nduru ahụ nʼụgbọ.