12“Ahụhụ dịrị onye ahụ na-eji ọbara ewu obodo, nke na-ejikwa ajọ omume eme ka obodo ahụ guzosie ike.
13Ọ bụ na ọ bụghị uche Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, na ndọgbu nʼọrụ niile nke mmadụ bụ na nkịtị, ihe e ji afụnwu ọkụ, na oke ọrụ niile nke mba dị iche iche bụ ihe lara nʼiyi?
14Nʼihi na ụwa niile ga-ejupụta na ihe ọmụma nke ebube Onyenwe anyị, dịka mmiri si ekpuchi oke osimiri.
15“Ahụhụ dịrị onye ahụ na-enye onye agbataobi ya mmanya, nke na-anọgide na-agbanyere ya mmanya tutu ruo mgbe mmanya bidoro igbu ya, ka o si otu a hụ ọtọ ya anya.
16Ihere ga-anọchi otuto na nsọpụrụ i nwere. Ṅụọ ka ị bụrụ onye mmanya na-egbu. Nʼihi na iko dị nʼaka nri Onyenwe anyị na-abịakwute gị. Ihere ga-anọchikwa anya otuto gị.