Habakuk 2

Ihere ga-anọchi otuto na nsọpụrụ i nwere. Ṅụọ ka ị bụrụ onye mmanya na-egbu. Nʼihi na iko dị nʼaka nri Onyenwe anyị na-abịakwute gị. Ihere ga-anọchikwa anya otuto gị.

Habakkuk 2:16 (UKJV) You are filled with shame for glory: drink you also, and let your foreskin be uncovered: the cup of the LORD's right hand shall be turned unto you, and shameful spewing shall be on your glory.

14Nʼihi na ụwa niile ga-ejupụta na ihe ọmụma nke ebube Onyenwe anyị, dịka mmiri si ekpuchi oke osimiri.

15“Ahụhụ dịrị onye ahụ na-enye onye agbataobi ya mmanya, nke na-anọgide na-agbanyere ya mmanya tutu ruo mgbe mmanya bidoro igbu ya, ka o si otu a hụ ọtọ ya anya.

16Ihere ga-anọchi otuto na nsọpụrụ i nwere. Ṅụọ ka ị bụrụ onye mmanya na-egbu. Nʼihi na iko dị nʼaka nri Onyenwe anyị na-abịakwute gị. Ihere ga-anọchikwa anya otuto gị.

17Ihe ike ahụ i mere Lebanọn ga-abịakwasịkwa gị. Mbibi i bibiri anụmanụ dị iche iche ga-emekwa ka egwu ju gị obi. Nʼihi na ị wụsịala ọbara ọtụtụ mmadụ, bibie ala na obodo dị iche iche, bibiekwa ndị niile bi nʼime ha.

18“Gịnị bụ uru arụsị bara ebe ọ bụ aka mmadụ kpụrụ ya? Kedụ uru igwe a kpụrụ akpụ bara, bụ nke na-ekwu okwu ụgha? Nʼihi na onye na-atụkwasị ha obi na-atụkwasị obi ya nʼihe ahụ aka ya rụpụtara, nʼihi na ọ bụ arụsị na-enweghị ike ikwu okwu ka o mere.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.