Habakuk 2

“Gịnị bụ uru arụsị bara ebe ọ bụ aka mmadụ kpụrụ ya? Kedụ uru igwe a kpụrụ akpụ bara, bụ nke na-ekwu okwu ụgha? Nʼihi na onye na-atụkwasị ha obi na-atụkwasị obi ya nʼihe ahụ aka ya rụpụtara, nʼihi na ọ bụ arụsị na-enweghị ike ikwu okwu ka o mere.

Habakkuk 2:18 (UKJV) What profits the graven image that the maker thereof has graven it; the molten image, and a teacher of lies, that the maker of his work trusts therein, to make dumb idols?

16Ihere ga-anọchi otuto na nsọpụrụ i nwere. Ṅụọ ka ị bụrụ onye mmanya na-egbu. Nʼihi na iko dị nʼaka nri Onyenwe anyị na-abịakwute gị. Ihere ga-anọchikwa anya otuto gị.

17Ihe ike ahụ i mere Lebanọn ga-abịakwasịkwa gị. Mbibi i bibiri anụmanụ dị iche iche ga-emekwa ka egwu ju gị obi. Nʼihi na ị wụsịala ọbara ọtụtụ mmadụ, bibie ala na obodo dị iche iche, bibiekwa ndị niile bi nʼime ha.

18“Gịnị bụ uru arụsị bara ebe ọ bụ aka mmadụ kpụrụ ya? Kedụ uru igwe a kpụrụ akpụ bara, bụ nke na-ekwu okwu ụgha? Nʼihi na onye na-atụkwasị ha obi na-atụkwasị obi ya nʼihe ahụ aka ya rụpụtara, nʼihi na ọ bụ arụsị na-enweghị ike ikwu okwu ka o mere.

19Ahụhụ dịrị onye ahụ na-agwa osisi okwu sị, ‘Dịrị ndụ.’ Ma ọ bụ nkume nke na-apụghị ikwu okwu, ‘Teta nʼụra.’ O nwere ike izi mmadụ ihe? Lee, ọ bụ ihe eji ọlaọcha na ọlaedo machie, ma ọ dịghị nkuume ọbụla dị nʼime ya.”

20Ma Onyenwe anyị nọ nʼime ụlọnsọ ukwu ya. Ya mere, ka ụwa niile dere duu nʼihu ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.