Habakuk 3

Onyenwe anyị anụla m ihe niile e kwuru banyere ude gị. Ịdị ukwuu nke ọrụ gị niile na-emekwa ka m dere duu nʼegwu nʼihu gị, Onyenwe anyị. Mekwaa ya ọzọ nʼoge nke anyị, mekwaa ka anụ akụkọ ya nʼọgbọ anyị. Nʼoke iwe gị chetakwa ebere.

Habakkuk 3:2 (UKJV) O LORD, I have heard your speech, and was afraid: O LORD, revive your work in the midst of the years, in the midst of the years make known; in wrath remember mercy.

1Nke a bụ ekpere Habakuk onye amụma kpere. Ọ dị nʼusoro Shiginot. Nke a bụ ihe o kwuru.

2Onyenwe anyị anụla m ihe niile e kwuru banyere ude gị. Ịdị ukwuu nke ọrụ gị niile na-emekwa ka m dere duu nʼegwu nʼihu gị, Onyenwe anyị. Mekwaa ya ọzọ nʼoge nke anyị, mekwaa ka anụ akụkọ ya nʼọgbọ anyị. Nʼoke iwe gị chetakwa ebere.

3Chineke si na Teman bịa, Onye Nsọ ahụ sikwa nʼugwu Paran. Sela Ebube ya na-ekpuchi eluigwe, otuto ya jupụtakwara nʼụwa.

4Ịma mma ya na-achapụta dịka ihe anyanwụ ụtụtụ, ihe na-enwupụta site nʼaka ya, ọ bụkwa nʼebe ahụ ka e zoro ike ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.