5Nʼihu ya ka ajọ ọrịa na-efe efe na-aga, oke mbibi na-esokwa ya nʼazụ.
6O guzoro ọtọ yọgharịa ụwa; o lere anya, mee ka mba niile maa jijiji. Ugwu ukwu ochie ahụ niile dara, ugwu nta ochie ndị ahụ dakwara. Nʼihi na ụzọ ya ga-adịgide ruo mgbe niile ebighị ebi.
7Ahụrụ m ụlọ ikwu nke Kushan ka ha nọ ọnọdụ ụbọchị ọjọọ, na ebe obibi ndị Midia ka ha nọ na oke ahụ ụfụ.
8Ọ bụ osimiri, ka gị bụ Onyenwe anyị were iwe megide? Ọnụma gị, ọ dị ukwuu megide iyi niile? Oke iwe gị ọ bụ megide oke osimiri mgbe ị nọkwasịrị nʼelu ịnyịnya gị, nakwa nʼelu ụgbọ ịnyịnya ị wetara ndị nke gị mmeri?
9I kpughepụrụ ụta gị, kpọọ oku ka a chịtara gị ọtụtụ àkụ. Sela I ji osimiri dị iche iche kewaa ụwa.