Habakuk 3

Nʼihu ya ka ajọ ọrịa na-efe efe na-aga, oke mbibi na-esokwa ya nʼazụ.

Habakkuk 3:5 (UKJV) Before him went the pestilence, and burning coals went forth at his feet.

3Chineke si na Teman bịa, Onye Nsọ ahụ sikwa nʼugwu Paran. Sela Ebube ya na-ekpuchi eluigwe, otuto ya jupụtakwara nʼụwa.

4Ịma mma ya na-achapụta dịka ihe anyanwụ ụtụtụ, ihe na-enwupụta site nʼaka ya, ọ bụkwa nʼebe ahụ ka e zoro ike ya.

5Nʼihu ya ka ajọ ọrịa na-efe efe na-aga, oke mbibi na-esokwa ya nʼazụ.

6O guzoro ọtọ yọgharịa ụwa; o lere anya, mee ka mba niile maa jijiji. Ugwu ukwu ochie ahụ niile dara, ugwu nta ochie ndị ahụ dakwara. Nʼihi na ụzọ ya ga-adịgide ruo mgbe niile ebighị ebi.

7Ahụrụ m ụlọ ikwu nke Kushan ka ha nọ ọnọdụ ụbọchị ọjọọ, na ebe obibi ndị Midia ka ha nọ na oke ahụ ụfụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.