Hegai 2

‘Onye nʼime unu nwere ike icheta otu ụlọnsọ ukwu nke mbụ si dị ebube? Ọ dị aṅaa nʼanya unu ugbu a? Ọ bụ na ọ dịghị unu ka ihe efu ugbu a.

Haggai 2:3 (UKJV) Who is left among you that saw this house in her first glory? and how do all of you see it now? is it not in your eyes in comparison of it as nothing?

1nʼụbọchị nke iri abụọ na otu, nʼọnwa nke asaa, okwu Onyenwe anyị si nʼọnụ onye amụma Hegai bịakwa na-asị:

2“Gwa Zerubabel nwa Shealtiel, onye na-achị Juda, na Joshua nwa Jehozadak, onyeisi nchụaja, na ndị Izrel ahụ fọdụrụ nʼala ahụ sị:

3‘Onye nʼime unu nwere ike icheta otu ụlọnsọ ukwu nke mbụ si dị ebube? Ọ dị aṅaa nʼanya unu ugbu a? Ọ bụ na ọ dịghị unu ka ihe efu ugbu a.

4Ma ugbu a nwee obi ike Zerubabel,’ ka Onyenwe anyị kwuru. ‘Nwekwaa obi ike gị Joshua onyeisi nchụaja, nwa Jehozadak. Nwekwaanụ obi ike unu ndị niile bi nʼala a.’ Ka Onyenwe anyị kwuru. ‘Rụọnụ ọrụ nʼihi na anọnyeere m unu,’ ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu.

5‘Nke a bụ ihe merenụ mgbe mụ na unu gbara ndụ nʼoge ahụ unu si nʼIjipt pụta. Mmụọ m na-anọgidekwa nʼetiti unu. Unu atụla egwu.’

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.