11Onye nchụaja ọbụla na-eguzo kwa ụbọchị na-efe ofufe, na-achụkwa otu aja ahụ ugboro ugboro, bụ aja nke na-enweghị ike ịsachapụ mmehie.
12Ma mgbe Kraịst chụchara naanị otu aja ahụ, otu ugboro nʼihi mmehie niile, ọ nọdụrụ ala nʼaka nri Chineke.
13Ebe ahụ ka ọ nọ ugbu a na-eche ka ndị iro ya niile bụrụ ihe mgbakwasị ụkwụ ya.
14Nʼihi na o sitela nʼotu aja mee ka ndị ahụ a na-eme ka ha dịrị nsọ zuo oke mgbe niile.
15Mmụọ nsọ na-agbakwara anyị ama banyere ihe ndị a mgbe o buru ụzọ kwuo: