15Mmụọ nsọ na-agbakwara anyị ama banyere ihe ndị a mgbe o buru ụzọ kwuo:
16“Nke a bụ ọgbụgba ndụ ahụ mụ na ha ga-agba mgbe oge ndị ahụ gasịrị, ka Onyenwe anyị kwuru. Aga m etinye iwu m nʼobi ha. Aga m edekwasịkwa ha nʼuche ha.”
17O kwukwara sị, “Agaghị m echetakwa mmehie ha na mmebi iwu ha niile ọzọ.”
18Ya mere, ebe ọ bụ na a gbagharala mmehie ndị a, ọ dịkwaghị mkpa ịchụ ajọ ọzọ maka mgbaghara mmehie.
19Nʼihi nke a, ụmụnna m, ebe anyị nwere nkwuwa okwu ịbanye nʼEbe Kachasị Nsọ site nʼọbara Jisọs,