1Iwu ahụ bụ naanị onyinyo na-egosi ihe ọma gaje ịbịa. Nʼihi ya, o zughị oke nʼonwe ya isite nʼaja ndị ahụ a na-achụ mgbe mgbe kwa afọ, mee ka ndị ahụ na-abịaru nso ife ofufe zuo oke.
2Ma ọ bụghị otu a, ọ bụ na a gabeghị akwụsị ịchụ aja ndị a? Ọ bụrụ na a sachapụla njọ ndị na-efe ofufe na mbụ, akọnuche ha agaghịkwa ama ha ikpe mmehie ha.
3Ma nke bụ eziokwu bụ na ihe aja ndị a na-eme bụ ichetara ha mmehie ha kwa afọ niile.
4Nʼihi na ọ bụ ihe na-apụghị ime eme na ọbara oke ehi na nke ụmụ ewu dị iche iche ga-asachapụ mmehie.
5Ya mere mgbe Kraịst bịara nʼụwa, ọ sịrị, “Aja na onyinye abụghị ihe ị chọrọ kama ị kwadoro ahụ nye m.