3Ma nke bụ eziokwu bụ na ihe aja ndị a na-eme bụ ichetara ha mmehie ha kwa afọ niile.
4Nʼihi na ọ bụ ihe na-apụghị ime eme na ọbara oke ehi na nke ụmụ ewu dị iche iche ga-asachapụ mmehie.
5Ya mere mgbe Kraịst bịara nʼụwa, ọ sịrị, “Aja na onyinye abụghị ihe ị chọrọ kama ị kwadoro ahụ nye m.
6Aja nsure ọkụ na aja a chụrụ maka mmehie, ha abụghị ihe dị ezi mma nye gị.
7Mgbe ahụ ka m sịrị, ‘Lee, abịala m Chineke m, ime ihe ị na-achọ. Nke a bụkwa ihe e dere banyere m nʼime akwụkwọ mpịakọta.’ ”