7Mgbe ahụ ka m sịrị, ‘Lee, abịala m Chineke m, ime ihe ị na-achọ. Nke a bụkwa ihe e dere banyere m nʼime akwụkwọ mpịakọta.’ ”
8O kwuru na mbụ, “Aja dị iche iche, na onyinye, na aja nsure ọkụ na aja mmehie adịghị atọ gị ụtọ, ha adịghịkwa amasị gị” (a chụrụ aja ndị a dịka iwu si dị).
9O kwukwara ọzọ, “Lee abịala m ime uche gị.” Ọ kagburu aja nke mbụ ahụ ma were aja nke abụọ dochie nʼọnọdụ ya.
10Site nʼime uche Chineke, e mere ka anyị dị nsọ site nʼaja Jisọs Kraịst ji onwe ya chụọ naanị otu ugboro.
11Onye nchụaja ọbụla na-eguzo kwa ụbọchị na-efe ofufe, na-achụkwa otu aja ahụ ugboro ugboro, bụ aja nke na-enweghị ike ịsachapụ mmehie.