1Ya mere, anyị aghaghị ilezi anya nke ọma banyere ihe anyị nụrụla, ka anyị hapụ isi na ha wezuga onwe anyị.
2Nʼihi na ọ bụrụ na ozi ahụ e ziri site na ndị mmụọ ozi dị ire, ọ bụrụkwa na njehie maọbụ nnupu isi ọbụla natara ahụhụ kwesiri ya.
3Anyị ga-esi aṅaa gbanarị ntaramahụhụ ma ọ bụrụ na anyị eleghara oke nzọpụta ahụ anya? Ọ bụ Onyenwe anyị kwupụtara ya, bụkwa nke ndị nụrụ ya gbaara anyị ama banyere ya.