Ndị Hibru 2

Ọ dịghị mgbe Chineke nyere ndị mmụọ ozi ike ịchị elu ụwa a. Anyị na-ekwu banyere ụwa gaje ịbịa abịa.

Hebrews 2:5 (UKJV) For unto the angels has he not put in subjection the world to come, whereof we speak.

3Anyị ga-esi aṅaa gbanarị ntaramahụhụ ma ọ bụrụ na anyị eleghara oke nzọpụta ahụ anya? Ọ bụ Onyenwe anyị kwupụtara ya, bụkwa nke ndị nụrụ ya gbaara anyị ama banyere ya.

4Chineke nʼonwe ya tụkwasịrị ịgba ama nke ya, site nʼịrụ ọrụ ebube na ọrụ ịrịbama, na ọrụ ịtụnanya dị iche iche, nakwa ikesa ọtụtụ onyinye nke Mmụọ Nsọ, dị ka ọchịchọ ya siri dị.

5Ọ dịghị mgbe Chineke nyere ndị mmụọ ozi ike ịchị elu ụwa a. Anyị na-ekwu banyere ụwa gaje ịbịa abịa.

6Otu onye agbaala akaebe nʼebe ọzọ, “Gịnị ka mmadụ bụ i ji na-eche banyere ha? Gịnị ka nwa nke mmadụ bụ iji na-elekọta ya?

7Nʼihi na i mere ka ha dị ala nwantakịrị nʼebe ndị mmụọ ozi nọ; i jikwa ebube na nsọpụrụ kpube ya nʼisi dịka okpueze,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.