5Ọ dịghị mgbe Chineke nyere ndị mmụọ ozi ike ịchị elu ụwa a. Anyị na-ekwu banyere ụwa gaje ịbịa abịa.
6Otu onye agbaala akaebe nʼebe ọzọ, “Gịnị ka mmadụ bụ i ji na-eche banyere ha? Gịnị ka nwa nke mmadụ bụ iji na-elekọta ya?
7Nʼihi na i mere ka ha dị ala nwantakịrị nʼebe ndị mmụọ ozi nọ; i jikwa ebube na nsọpụrụ kpube ya nʼisi dịka okpueze,
8dokwaa ihe niile nʼokpuru ụkwụ ya.” Mgbe o mere ka ihe niile dịrị nʼokpuru ya, o nwekwaghị ihe ọbụla ọ hapụrụ itinye nʼokpuru ya. Ma otu ọ dị, anyị ahụbeghị ka e doro ihe niile nʼokpuru ya.
9Ma anyị na-ahụ Jisọs bụ onye e mere ka ọ dị ala nwantakịrị oge karịa ndị mmụọ ozi, ma ugbu a ejirila ebube na nsọpụrụ kpukwasị ya nʼisi, nʼihi ahụhụ ọnwụ nke ọ hụrụ, ka o site nʼamara Chineke detụ ọnwụ ire nʼihi mmadụ niile.