5Ma nʼebe a kwa, e kwuru, “Ha agaghị abanye nʼebe izuike m ma ọlị.”
6Ebe ọ bụ na ohere dịịrị ụfọdụ mmadụ ịbanye nʼime ya, ma ndị ahụ buru ụzọ nata oziọma ahụ abanyeghị nʼihi nnupu isi.
7O wepụtara ụbọchị ọzọ nke ọ kpọrọ Taa, o sitere nʼọnụ Devid kwuo okwu ahụ e kwurula ihe banyere nʼoge gara aga sị, “Taa, ọ bụrụ na unu anụ olu ya, unu emela ka obi unu sie ike.”
8Nʼihi na a sị na Joshua nyere ha ezumike, ọ gaghị ekwu banyere ụbọchị ọzọ.
9Otu ụbọchị izuike fọdụrụ nye ndị nke Chineke.