13Mgbe Chineke kwere Ebraham nkwa, o ji onwe ya ṅụọ iyi, nʼihi na ọ dịghị onye ọzọ dị ukwuu karịa ya,
14na-asị, “Nʼezie aga m agọzi gị, nyekwa gị ọtụtụ ụmụ ụmụ.”
15Ebraham nwere ndidi, natakwa ihe e kwere ya na nkwa.
16Ụmụ mmadụ na-eji ndị ka ha ukwuu ṅụọ iyi, iyi aṅụrụ nʼụzọ dị otu a na-eme ka ihe e kwuru guzosie ike ma wezugakwa ịrụ ụka niile nʼetiti mmadụ.
17Ya mere, mgbe Chineke chọrọ igosi ndị ahụ ga-eketa nkwa ahụ, ụdịdị izuzu ya, o jiri ịṅụ iyi mee ka o doo ha anya na izuzu ya adịghị agbanwe agbanwe.