11Anyị chọrọ ka onye ọbụla nʼime unu nọgidesie ike nʼotu ịnụ ọkụ nʼobi ahụ ruo ọgwụgwụ ihe niile, ka unu nwee olileanya inwezu ihe niile unu na-atụ anya ya mgbe oge ruru.
12Anyị achọghị ka unu bụrụ ndị umengwụ, kama ka unu bụrụ ndị na-eṅomi ndụ ahụ jiri okwukwe na ntachiobi nweta ihe ahụ e kwere na nkwa.
13Mgbe Chineke kwere Ebraham nkwa, o ji onwe ya ṅụọ iyi, nʼihi na ọ dịghị onye ọzọ dị ukwuu karịa ya,
14na-asị, “Nʼezie aga m agọzi gị, nyekwa gị ọtụtụ ụmụ ụmụ.”
15Ebraham nwere ndidi, natakwa ihe e kwere ya na nkwa.