15Ebraham nwere ndidi, natakwa ihe e kwere ya na nkwa.
16Ụmụ mmadụ na-eji ndị ka ha ukwuu ṅụọ iyi, iyi aṅụrụ nʼụzọ dị otu a na-eme ka ihe e kwuru guzosie ike ma wezugakwa ịrụ ụka niile nʼetiti mmadụ.
17Ya mere, mgbe Chineke chọrọ igosi ndị ahụ ga-eketa nkwa ahụ, ụdịdị izuzu ya, o jiri ịṅụ iyi mee ka o doo ha anya na izuzu ya adịghị agbanwe agbanwe.
18Ka ọ ga-abụ site nʼihe abụọ na-enweghị mgbanwe, nke na-agaghị ekwe omume izi Chineke dịka onye ụgha, anyị bụ ndị gbara ọsọ ndụ ga-enweta agbamume siri ike iji jide olileanya e dobeere anyị.
19Anyị nwere olileanya a dị ka arịlịka nke mkpụrụobi nke guzosiri ike ma bụrụkwa nke e chekwara. Ọ na-abanye nʼime ime ebe nchụaja ahụ nʼazụ akwa mgbochi