Ndị Hibru 7

Ebraham nyekwara ya otu ụzọ nʼime ụzọ iri nke ihe niile. Ihe mbụ aha ya pụtara bụ, “eze ezi omume,” ọzọkwa bụ “eze nke Salem,” nke pụtara, “eze udo.”

Hebrews 7:2 (UKJV) To whom also Abraham gave a tenth part of all; first being by interpretation King of righteousness, and after that also King of Salem, which is, King of peace;

1Melkizedek a bụ eze Salem, bụrụkwa onye nchụaja Chineke Onye kachasị ihe niile elu. Ọ zutere Ebraham mgbe o si na mmeri o meriri ọtụtụ ndị eze ahụ na-alọghachi, gọziekwa ya.

2Ebraham nyekwara ya otu ụzọ nʼime ụzọ iri nke ihe niile. Ihe mbụ aha ya pụtara bụ, “eze ezi omume,” ọzọkwa bụ “eze nke Salem,” nke pụtara, “eze udo.”

3O nweghị nna, o nwekwaghị nne, nke ọ na-enwe agbụrụ. O nweghị mmalite nke ụbọchị a mụrụ ya, maọbụ ọgwụgwụ ndụ, e mere ya dị ka Ọkpara Chineke. Ọ na-anọgide bụrụ onye nchụaja ruo mgbe ebighị ebi.

4Leenụ otu o siri bụrụ onye dị ukwuu, ọ bụladị Ebraham bụ nna nna anyị nyere ya otu ụzọ nʼime ụzọ iri site nʼihe ọ kwatara nʼagha!

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.