12Ya mere, ghaanụ mkpụrụ ezi omume maka onwe unu, unu ga-aghọtakwa mkpụrụ ịhụnanya. Kọgharịakwanụ obi unu siri ike, nʼihi na ugbu a bụ oge ịchọ Onyenwe anyị, tutu ruo mgbe ọ bịara wụkwasị unu mmiri ozuzo dịka ezi omume.
13Ma unu akụọla mkpụrụ ajọ omume; unu aghọtakwala ihe ọjọọ dịka ihe ubi. Unu eriela mkpụrụ osisi ụgha. Nʼihi na unu atụkwasịla obi unu nʼịdị ike nke onwe unu, na nʼịdị ọtụtụ nke ndị bụ dike nʼagha unu.
14Nʼihi ya, ụzụ nke ibu agha aghaghị ibili nʼetiti unu, ebe unu niile e wusiri ike ga-ada. Ọ ga-ada dịka Shalman si bibie Bet Abel nʼụbọchị agha, mgbe a tụpịara ndị bụ nne na ụmụ ha.
15Ọ bụ ihe dị otu a ga-adakwasị gị, Betel, nʼihi na ajọ omume gị dị ukwuu. Mgbe chi ụbọchị ahụ bọrọ, a ga-ala eze Izrel nʼiyi kpamkpam.