1Izrel bụ osisi vaịnị dị mma, nke na-amịta mkpụrụ nke ukwuu. Dịka mkpụrụ ya na-aba ụba, otu a ka o si amụba ebe ịchụ aja ya. Dịka ala ya na-abawanyekwa ụba otu a ka o si edoziri onwe ya nkume dị nsọ.
2Obi ha dị aghụghọ, ma ugbu a, ha ga-ata ahụhụ maka ikpe ọmụma ha. Onyenwe anyị ga-akwatu ebe nchụaja ha, ma mebikwaa ogidi nkume nsọ ha niile.
3Ma ugbu a, ha ga-asị, “Anyị enweghị eze, nʼihi na anyị anaghị atụ Onyenwe anyị egwu, ma olee ihe eze nwere ike ị mere anyị?”
4Ha na-ekwu okwu na-abaghị uru, were ịṅụ iyi na-agbakwa ndụ, ya mere ikpe ikpe jiri jupụta nʼebe niile, dịka ahịhịa ọjọọ nʼubi.
5Ndị bi na Sameria ga-atụ ụjọ nʼihi chi nke nwa ehi a kpụrụ akpụ dị na Bet-Aven. Ndị ya ga-eruru ya ụjụ, otu a kwa ka ndị nchụaja ya rụrụ arụ ga-esi ruoru ya ụjụ, maka ebube nke a napụrụ ya.