1“Mgbe Izrel bụ nwantakịrị, ahụrụ m ya nʼanya, ọ bụkwa site nʼIjipt ka m kpọpụtara nwa m.
2Ma dịka m na-akpọ ha, otu a ka ha na-aga nʼebe dị anya site nʼebe m nọ. Ha chụrụ Baal aja, surekwa aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye arụsị dị iche iche.
3Ọ bụ mụ onwe m kuziiri Ifrem otu e si aga ije, ejidere m ha nʼaka m abụọ, ma ha amaghị na ọ bụ mụ onwe m gwọrọ ya.