Hosiya 11

Ọ bụ mụ onwe m kuziiri Ifrem otu e si aga ije, ejidere m ha nʼaka m abụọ, ma ha amaghị na ọ bụ mụ onwe m gwọrọ ya.

Hosea 11:3 (UKJV) I taught Ephraim also to go, taking them by their arms; but they knew not that I healed them.

1“Mgbe Izrel bụ nwantakịrị, ahụrụ m ya nʼanya, ọ bụkwa site nʼIjipt ka m kpọpụtara nwa m.

2Ma dịka m na-akpọ ha, otu a ka ha na-aga nʼebe dị anya site nʼebe m nọ. Ha chụrụ Baal aja, surekwa aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye arụsị dị iche iche.

3Ọ bụ mụ onwe m kuziiri Ifrem otu e si aga ije, ejidere m ha nʼaka m abụọ, ma ha amaghị na ọ bụ mụ onwe m gwọrọ ya.

4Eji m ụdọ nke mmadụ bụ ebere, na ịhụnanya duo ya. Adịrị m ha dịka onye nʼebuli ibu arọ site nʼolu ha, ehulatakwara m ala, were aka m tinye ha nri nʼọnụ.

5“Ọ bụ na ha agaghị alaghachi azụ nʼIjipt, Asịrịa ọ gaghị abụ eze ha, nʼihi na ha ajụla ịlọghachikwute m?

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.