1Akaọrụ Ifrem bụ naanị ịchụso ikuku, ọ na-achụso ikuku si nʼọwụwa anyanwụ bido nʼụtụtụ ruo nʼabalị. Otu a ka ha si eme ka ịgha ụgha, na ime ihe ike na-abawanye ụba. Ha na Asịrịa na-agbakwa ndụ, ha na-ebugakwa mmanụ nʼIjipt.
2Onyenwe anyị na-akpọ Juda ikpe. Ọ ga-ata Jekọb ahụhụ dịka ụzọ ya si dị, kwụghachikwa ya dịka omume ya si dị.
3Mgbe ọ nọ nʼafọ nne ya ka o jidere nwanne ya nwoke nʼikiri ụkwụ. Mgbe ọ ghọrọ dimkpa, ya na Chineke gbara mgba.