10Nʼihi na ha ga-agbaso Onyenwe anyị. Ọ ga-agbọkwa ụja dịka ọdụm. Mgbe ọ gbọrọ ụja, ụmụ ya ga-eji ịma jijiji site nʼakụkụ ọdịda anyanwụ bịakwute ya.
11Dịka igwe nnụnụ ka ha ga-ama jijiji bịa site nʼIjipt, dịka nduru ka ha ga-efelata site nʼAsịrịa. Aga m eme ka ha biri nʼụlọ ha ọzọ,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
12Ifrem e jirila okwu ụgha gbaa m gburugburu, ezinaụlọ Izrel e jirila aghụghọ na-emeso m omume, ma Juda nọsịrị ike nʼekweghị nchịkọta nʼebe Chineke nọ, ọbụladị megide Onye Nsọ ahụ nke kwesiri ntụkwasị obi.