2Onyenwe anyị na-akpọ Juda ikpe. Ọ ga-ata Jekọb ahụhụ dịka ụzọ ya si dị, kwụghachikwa ya dịka omume ya si dị.
3Mgbe ọ nọ nʼafọ nne ya ka o jidere nwanne ya nwoke nʼikiri ụkwụ. Mgbe ọ ghọrọ dimkpa, ya na Chineke gbara mgba.
4E, ya na mmụọ ozi gbara mgba. Nʼoge ahụ, o jidesiri ya aka ike, kwaa akwa, rịọọ ngọzị site nʼaka ya. Ọ hụrụ ya na Betel, gwaakwa ya okwu,
5Onyenwe anyị Chineke onye pụrụ ime ihe niile, Onyenwe anyị bụ aha ya.
6Ịghaghị ịlọghachikwute Chineke gị, guzosie ike nʼịhụnanya na ikpe ziri ezi, na-elekwa anya Chineke gị mgbe niile.