5Onyenwe anyị Chineke onye pụrụ ime ihe niile, Onyenwe anyị bụ aha ya.
6Ịghaghị ịlọghachikwute Chineke gị, guzosie ike nʼịhụnanya na ikpe ziri ezi, na-elekwa anya Chineke gị mgbe niile.
7Onye ahịa na-eji ihe ọtụtụ aghụghọ na-erenye ndị mmadụ ahịa, ọ hụrụ imegbu emegbu nʼanya.
8Ifrem kwuru, “Abaala m ọgaranya! Abụrụla m onye nwere akụnụba dị ukwuu! Ọ bụ ezie na m bụ onye nwere akụ dị ukwuu, ma agaghị achọta njehie maọbụ mmehie ọbụla nʼime m.”
9“Abụ m Onyenwe anyị na Chineke gị, onye si nʼIjipt kpọpụta unu. Aga m emekwa ka ị biri nʼụlọ ikwu ọzọ, dịka ọ dị nʼoge mmemme ndị ahụ niile a kara aka.