9“Aga m ala gị nʼiyi, gị Izrel, onye pụrụ inyere gị aka?
10Ebee ka ndị eze gị nọ, ka ha bịa zọpụta gị? Ebee ka ndịisi ọchịchị nke obodo gị niile nọ, bụ ndị ahụ i ji nʼihi ha na-asị, ‘Nye m eze na ndị ọchịchị’?
11Esitere m nʼiwe m nye gị eze, sitekwa nʼọnụma m, napụ gị ya.
12Njehie nke Ifrem ka e kechikọtara debe; a na-edetukwa mmehie ya niile nʼakwụkwọ.
13Ihe mgbu nke dịka ihe mgbu nwanyị ime na-eme na-abịakwasị ya; maọbụ nwantakịrị na-enweghị uche. Mgbe oge ya zuru, ọ jụrụ ịpụta site nʼọnụ akpanwa ka a mụpụta ya.