3Nʼihi ya, ha ga-adị ka igirigi nke ụtụtụ, maọbụ igirigi nke na-agbachapụ ngwangwa, dịka igbugbo nke a fụchapụrụ nʼebe ịzọcha ọka, dịka anwụrụ ọkụ nke si na oghereikuku na-ekupụ.
4“Ma mụ onwe m bụ Onyenwe anyị na Chineke gị, siterịị nʼala Ijipt. Unu agaghị anabatara onwe unu Chineke ọzọ karịa m. Ọ dịghị Onye nzọpụta ọzọ dị karịa m.
5Elekọtara m unu nʼime ọzara, nʼala ahụ kpọrọ nkụ, nke mmiri na-adịghị.
6Mgbe m nyere ha nri, ha rijukwara afọ. Mgbe afọ juru ha, ha bidoro ịkpa nganga, chefuo m.
7Nʼihi ya, aghaghị m ịbịakwasị ha dịka ọdụm; maọbụ dịka agụ nke na-ezo onwe ya nʼakụkụ ụzọ.