5Elekọtara m unu nʼime ọzara, nʼala ahụ kpọrọ nkụ, nke mmiri na-adịghị.
6Mgbe m nyere ha nri, ha rijukwara afọ. Mgbe afọ juru ha, ha bidoro ịkpa nganga, chefuo m.
7Nʼihi ya, aghaghị m ịbịakwasị ha dịka ọdụm; maọbụ dịka agụ nke na-ezo onwe ya nʼakụkụ ụzọ.
8Aga m adakwasị ha dịka anụ ọhịa bịa nke a gbabara aka ụmụ ya, dọwasịa anụ ahụ kpuchiri obi ha aga m eripịa ha dịka ọdụm, anụ ọhịa ga-adọkasịkwa ha.
9“Aga m ala gị nʼiyi, gị Izrel, onye pụrụ inyere gị aka?