9“Ya mere, aga m ewerekwa ọka m mgbe ọ chara, na mmanya ọhụrụ m mgbe oge ya ruru. Aga m anapụkwa ya akwa ajị anụ m na akwa ọcha m, nke ekwesiri iji kpuchie ọtọ ya.
10Ugbu a, aga m ekpughe ọtọ ya nʼihu ndị ahụ na-ahụ ya nʼanya, ọ dịkwaghị onye nwere ike ịnapụta ya site nʼaka m.
11Aga m eme ka obi ụtọ ya kwụsị; ọ bụladị mmemme nke afọ niile, mmemme ọnwa ọhụrụ, nke ụbọchị izuike na mmemme ndị ọzọ ahụ niile a kara aka.
12Aga m ala ubi vaịnị ya na osisi fiig ya niile nʼiyi, nke ọ sịrị bụ ụgwọ ọrụ ya site nʼaka ndị hụrụ ya nʼanya; aga m emekwa ka ha ghọọ oke ọhịa, anụ ọhịa ga-eripịa ha.
13Aga m enye ya ahụhụ maka ụbọchị niile bụ nke o surere ihe na-esi isi ụtọ nye chi Baal niile, ọ chịrị mgbaaka mkpịsịaka na ihe ịchọ mma niile, jikere onwe ya, pụọ chụso ndị ahụ hụrụ ya nʼanya, ma chezọọ m,” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.