7Ọ ga-agbaso ndị ahụ hụrụ ya nʼanya ma ọ gaghị achụkwute ha. Ọ ga-achọ ha ma ọ gaghị ahụ ha. Mgbe ahụ, ọ ga-asị, ‘Ka m gaa laghachikwuru di mbụ m, nʼihi na ọ dịrị m mma mgbe ahụ karịa ugbu a.’
8Ma ọ kwetaghị na ihe ndị a si nʼaka m, na ọ bụ mụ nyere ya ọka, na mmanya ọhụrụ, na mmanụ oliv, na ọlaọcha, na ọlaedo ndị ahụ niile nke o ji na-efe Baal.
9“Ya mere, aga m ewerekwa ọka m mgbe ọ chara, na mmanya ọhụrụ m mgbe oge ya ruru. Aga m anapụkwa ya akwa ajị anụ m na akwa ọcha m, nke ekwesiri iji kpuchie ọtọ ya.
10Ugbu a, aga m ekpughe ọtọ ya nʼihu ndị ahụ na-ahụ ya nʼanya, ọ dịkwaghị onye nwere ike ịnapụta ya site nʼaka m.
11Aga m eme ka obi ụtọ ya kwụsị; ọ bụladị mmemme nke afọ niile, mmemme ọnwa ọhụrụ, nke ụbọchị izuike na mmemme ndị ọzọ ahụ niile a kara aka.