13Aga m enye ya ahụhụ maka ụbọchị niile bụ nke o surere ihe na-esi isi ụtọ nye chi Baal niile, ọ chịrị mgbaaka mkpịsịaka na ihe ịchọ mma niile, jikere onwe ya, pụọ chụso ndị ahụ hụrụ ya nʼanya, ma chezọọ m,” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
14“Nʼihi nke a, aga m arara ya, duba ya nʼime ọzara, jiri olu dị nro gwa ya okwu nʼebe ahụ.
15Ebe ahụ ka m ga-enyeghachi ya ubi vaịnị ya, gbanweekwa Ndagwurugwu Akọ, mee ka ọ ghọọ ọnụ ụzọ olileanya. Mgbe ahụ, ọ ga-azakwa m dịka o mere mgbe ọ bụ agbọghọbịa, nʼoge ahụ o si nʼala Ijipt pụta.
16“Nʼụbọchị ahụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “Ị ga-akpọ m ‘Di m,’ ị gaghị akpọkwa m ‘nna m ukwu,’ ọzọ.
17Nʼihi na aga m ewepụkwa aha niile nke arụsị Baal nʼegbugbere ọnụ ya, ha gaghị akpọkwa ha aha ọzọ.