Hosiya 2

Ma ọ bụghị otu a, aga m eyipụ ya uwe ya mee ka ọ gbara ọtọ, aga m eme ka o gbara ọtọ dị ka nʼụbọchị ahụ a mụrụ ya. Aga m eme ya ka ọ dị ka ọzara, ka ọ ghọọ nʼala kpọrọ nkụ, were akpịrị ịkpọ nkụ mee ka ọ nwụọ.

Hosea 2:3 (UKJV) Lest I strip her naked, and set her as in the day that she was born, and make her as a wilderness, and set her like a dry land, and slay her with thirst.

1“Gwa ụmụnne gị ndị nwoke Ami, ‘nke pụtara ndị m,’ gwakwa ụmụnne gị nwanyị Ruhama, nke pụtara, ‘Unu ndị m hụrụ nʼanya.’

2“Unu guzogidenụ nne unu, rịọọnụ ya, nʼihi na ọ bụghị nwunye m, mụ onwe m abụkwaghị di ya. Gwanụ ya ka o wezuga ịkwa iko site nʼihu ya, ya wezugakwa ịgba akwụna nke dị nʼetiti ara ya abụọ.

3Ma ọ bụghị otu a, aga m eyipụ ya uwe ya mee ka ọ gbara ọtọ, aga m eme ka o gbara ọtọ dị ka nʼụbọchị ahụ a mụrụ ya. Aga m eme ya ka ọ dị ka ọzara, ka ọ ghọọ nʼala kpọrọ nkụ, were akpịrị ịkpọ nkụ mee ka ọ nwụọ.

4Agaghị m egosi ụmụ ya ebere m, nʼihi na ha bụ ụmụ a kwatara nʼiko.

5Nʼihi na nne ha bụ onye na-akwa iko, ọ tụrụ ime ha nʼọnọdụ ihere. Site nʼikwu sị, ‘Aghaghị m ịgbakwuru ndị enyi nwoke hụrụ m nʼanya, ndị na-enye m nri na mmiri, ajị anụ m na akwa ọcha m, mmanụ oliv m na ihe ọṅụṅụ m.’

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.