3Ma ọ bụghị otu a, aga m eyipụ ya uwe ya mee ka ọ gbara ọtọ, aga m eme ka o gbara ọtọ dị ka nʼụbọchị ahụ a mụrụ ya. Aga m eme ya ka ọ dị ka ọzara, ka ọ ghọọ nʼala kpọrọ nkụ, were akpịrị ịkpọ nkụ mee ka ọ nwụọ.
4Agaghị m egosi ụmụ ya ebere m, nʼihi na ha bụ ụmụ a kwatara nʼiko.
5Nʼihi na nne ha bụ onye na-akwa iko, ọ tụrụ ime ha nʼọnọdụ ihere. Site nʼikwu sị, ‘Aghaghị m ịgbakwuru ndị enyi nwoke hụrụ m nʼanya, ndị na-enye m nri na mmiri, ajị anụ m na akwa ọcha m, mmanụ oliv m na ihe ọṅụṅụ m.’
6Nʼihi nke a, aga m eji ogwu na uke gbachie ya gburugburu; aga m agbachi ụzọ ya, mee ya ka ọ ghara ịma ebe ọ na-eje.
7Ọ ga-agbaso ndị ahụ hụrụ ya nʼanya ma ọ gaghị achụkwute ha. Ọ ga-achọ ha ma ọ gaghị ahụ ha. Mgbe ahụ, ọ ga-asị, ‘Ka m gaa laghachikwuru di mbụ m, nʼihi na ọ dịrị m mma mgbe ahụ karịa ugbu a.’