Hosiya 5

Ifrem bụ onye a na-emegbu emegbu, onye e ji ike na-azọpịa, nʼihi na ọ kpacha anya na-achụso ihe efu.

Hosea 5:11 (UKJV) Ephraim is oppressed and broken in judgment, because he willingly walked after the commandment.

9A ga-ebibi Ifrem kpamkpam nʼụbọchị ahụ m ga-ata ha ahụhụ. Nʼetiti ebo nke Izrel niile, ka m na-ekwusa ka amara na ọ bụ okwu kwesiri ntụkwasị obi.

10Ndị ndu Juda adịla ka ndị ahụ na-ewezuga oke ala, aga m awụkwasị ha iwe m dịka uju mmiri ozuzo.

11Ifrem bụ onye a na-emegbu emegbu, onye e ji ike na-azọpịa, nʼihi na ọ kpacha anya na-achụso ihe efu.

12Adị m ka nla nye Ifrem, dịkwa ka ihe na-eweta ire ure dịịrị ndị Juda.

13“Mgbe Ifrem hụrụ ụdị ọrịa ọ na-arịa, Juda ahụkwa ọnya dị ya nʼahụ, mgbe ahụ Ifrem gakwuru ndị Asịrịa, ma zigakwara eze ukwu ahụ ozi. Ma ọ pụghị ịgwọ gị, maọbụ gwọọ ọnya gị niile.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.