12Adị m ka nla nye Ifrem, dịkwa ka ihe na-eweta ire ure dịịrị ndị Juda.
13“Mgbe Ifrem hụrụ ụdị ọrịa ọ na-arịa, Juda ahụkwa ọnya dị ya nʼahụ, mgbe ahụ Ifrem gakwuru ndị Asịrịa, ma zigakwara eze ukwu ahụ ozi. Ma ọ pụghị ịgwọ gị, maọbụ gwọọ ọnya gị niile.
14Nʼihi na-aga m adị ka ọdụm nye Ifrem dịkwa ka nwa ọdụm nye Juda. Aga m adọkasị anụ ahụ ha ma hapụ ha pụọ. Aga m ebupụ ha pụọ, na-enweghị onye ga-abịa ịzọpụta ha.
15Aga m alaghachi azụ nʼọnọdụ m, ruo mgbe ha kweere na ikpe mara ha, ma chọọ ihu m; nʼọnọdụ mmekpa ahụ ha, ha ga-achọsi m ike.”